Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 64 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Chineke, nuru olum n'itughari-uchem: Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.

2 I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ: N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:

3 Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:

4 Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche: Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.

5 Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike; Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo; Ha siri, Ònye gāhu ha?

6 Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma: Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

7 Ma Chineke nāb͕a ha àkú; Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.

8 Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.

9 Madu nile gātu kwa egwu; We gosi ọlu Chineke, Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.

10 Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya; Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan