Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 63 - Bible Nso


Abù Ọma Devid, mb͕e ọ nọ n'ọzara Juda.

1 Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.

2 Otú a ka m'lekwasiworo Gi anya n'ebe nsọ gi, Ihu ike-Gi na nsọpuru-Gi.

3 N'ihi na ebere-Gi di nma kari ndu; Eb͕ub͕ere-ọnum abua gāja Gi.

4 Otú a ka m'gāgọzi Gi mb͕e m na-ādi ndu: N'aha-Gi ka m'gāchili akam elu.

5 Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;

6 Ọ buru na echetam I n'elu utem, Nime nche-abali nile ka m'nātughari uchem na Gi.

7 N'ihi na I buworom iye-aka, Ọ bu kwa n'okpuru ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'nēti nkpu ọṅù.

8 Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu: Mu ka aka-nri-gi jideworo.

9 Ma ndi ahu, ọ bu ime ka ọ la n'iyì ka ha nāchọ nkpuru-obim, Ha gābà n'ebe nile di ala nke uwa.

10 Agarara ha nye n'aka mma-agha: Òkè nke nkita-ọhia ka ha gābu.

11 Ma eze gāṅuri na Chineke: Onye ọ bula nke nēwere Ya ṅu iyi gānya isi; N'ihi na agēkpuchi ọnu nke ndi nēkwu okwu-ugha.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan