Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 62 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; dika Jedutun si abù abù. Abù Ọma Devid.

1 Ọ bu nání Chineke ka nkpuru-obim nēdere du: N'aka-Ya ka nzọputam si bia.

2 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum ri nne.

3 Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu? Unu nētipia ya, unu nile, Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.

4 Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù; Okwu-ugha nātọ ha utọ: Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah

5 Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim; N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.

6 Nání Ya onwe-ya bu oké nkumem na nzọputam: Ọ bu ulo-elum; agaghi-ewezugam n'ọnọdum.

7 N'ebe Chineke nọ ka nzọputam na nsọpurum di: Oké nkume nke ikem, bú ebe-nb͕abàm, di nime Chineke.

8 Tukwasinu Ya obi na mb͕e nile, unu ndi-Ya; Wusinu obi-unu n'iru Ya dika miri: Chineke buru ayi ebe-nb͕abà. Selah

9 Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.

10 Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.

11 Otù ub͕ò ka Chineke kwuworo okwu, Ub͕ò abua ka m'nuworo nka; Na ike nile bu ihe Chineke nwere:

12 Ọ bu kwa Gi nwe ebere, Onye-nwe-ayi: N'ihi na Gi onwe-gi nākwughachi madu ọ bula dika ọlu-ya si di.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan