Abụ Ọma 60 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Shushan Eduth: Michtam Devid, izí ihe: mb͕e ọ lusoro Eram-naharaim, luso kwa Eram-zoba, ọ̀gù, Joab we laghachi, tib͕ue Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù madu na nnù iri. 1 Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ. 2 I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu. 3 I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike: I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ. 4 I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ, Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah 5 Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya, Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi. 6 Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha: M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot. 7 Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem. 8 Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim. 9 Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom? 10 Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke. 11 Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u: N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu. 12 Nime Chineke ayi ga-eme ihe dìnkpà: Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpab͕u ayi |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria