Abụ Ọma 57 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù: Al-tashheth. Abù Ọma nke Devid: Michtam: mb͕e ọ b͕apuru n'iru Sọl ba n'ọb͕à. 1 Merem amara, Chineke, merem amara; N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo: Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà, Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga. 2 M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu; M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe. 3 O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam, Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; Selah Chineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya. 4 Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ. 5 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile. 6 Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile; Nkpuru-obim erudawo n'ala: Ha egwuwo olùlù n'irum; Ha adabàwo n'etiti ya. Selah 7 Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim: M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma. 8 Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ. 9 M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi: M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile. 10 N'ihi na ebere-Gi di uku rue elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé. 11 Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke; Ka ebube-Gi di n'elu uwa nile. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria