Abụ Ọma 52 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Maschil Devid: mb͕e Doeg, bú onye Edom, biara gosi Sọl, si ya, Devid bara n'ulo Ahimelek. 1 Gini mere i nēto onwe-gi n'ihe ọjọ, gi dike? Ebere Chineke nādigide ogologo ubọchi nile. 2 Ihe-ila-n'iyì di iche iche ka ire-gi nēchè; Dika aguba di nkọ, nālu ọlu aghughọ. 3 I huwo ihe ọjọ n'anya kari ezi ihe; Na okwu-ugha kari ikwu okwu ezi omume. Selah 4 I huwo okwu nile nēloda eloda n'anya, Gi ire aghughọ. 5 Chineke gākwatu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ gējide gi, dọkpupu gi n'ulu-ikwū-gi, Ropu kwa gi n'ala ndi di ndu. Selah 6 Ndi ezi omume gāhu kwa ya we tua egwu, Chì kwa ya ọchi, si, 7 Le, nwoke nke nādighi-eme Chineke ebe-ya siri ike; Kama ọ tukwasiri obi n'uba nke àkù-ya, Ọ di ike n'ọchichọ ọjọ ya. 8 Ma mu onwem, adim ka osisi olive nwere akwukwọ ndu n'ulo Chineke: Atukwasiwom obi n'ebere Chineke rue mb͕e nile ebighi-ebi. 9 M'gēkele Gi rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I meworo ya: M'gēle kwa anya aha-Gi, n'ihi na ọ di nma, niru ndi-ebere-Gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria