Abụ Ọma 51 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid: mb͕e Netan, bú onye-amuma, biakutere ya, mb͕e ọ bakusiri Bat-sheba. 1 Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile. 2 Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha. 3 N'ihi na mu onwem mara njehiem nile: Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile. 4 Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo, Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo: Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe. 5 Le, n'ajọ omume ka amuputaram; Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem. 6 Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ: Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe. 7 I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha: I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow. 8 I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù; Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù. 9 Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile. 10 Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem. 11 Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi. 12 Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem. 13 M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile; Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi. 14 Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam; Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi. 15 Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua; Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi. 16 N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya: Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ. 17 Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa: Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya. 18 Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ: I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem. 19 Mb͕e ahu ka àjà nile nke ezi omume, bú àjà-nsure-ọku na àjà-nsuresi-ọku, gātọ Gi utọ: Mb͕e ahu ka ha gāchu ọtutu oke-ehi n'elu ebe-ichu-àjà-Gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria