Abụ Ọma 5 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nke agābù n'ib͕u Ọjà. Abù Ọma Devid. 1 Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova, Ghọta ntughari-uchem. 2 Ṅa nti n'olu ntiku m'nētiku Gi, Ezem, na Chinekem: N'ihi na ọ bu Gi ka m'nēkpere. 3 Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche. 4 N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu: Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ. 5 Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi: I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì. 6 I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì: Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú. 7 Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi. 8 Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu; Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum. 9 N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya; Ime-ha bu ila-n'iyì nile: Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha nēkwu okwu ire-utọ. 10 Ma ha ikpe, Chineke; Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha: N'uba nke njehie nile ha nupu ha; N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi. 11 Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria, Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò: Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi. 12 N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria