Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 48 - Bible Nso


Abù; Abù Ọma umu Kora.

1 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku, N'obodo Chineke-ayi, bú ugwu nsọ Ya.

2 Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu, Bú obodo Eze ukwu.

3 Chineke Nke nọ n'ulo nile ya di elu emewo ka amara Ya na Ya bu ulo-elu.

4 N'ihi na, le, ndi-eze zukọro, Ha gabigara n'otù.

5 Ha onwe-ha huru ya, ibobo we nwua ha n'aru; Ha mara jijiji, zọlie ọsọsọ.

6 Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu; Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.

7 I ji ifufe Iru-anyanwu Tiwa ub͕ọ nile nke Tashish.

8 Dika ayi nuworo, otú a ka ayi huworo N'obodo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'obodo Chineke-ayi: Chineke gēme ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9 Ayi echèwo ebere-Gi echè, Chineke, N'etiti ulo uku Gi.

10 Dika aha-Gi si di, Chineke, Otú a ka otuto-Gi di rue nsọtu nile nke uwa: Ezi omume juputara aka-nri-Gi.

11 Ka ugwu Zaion ṅuria ọṅu, Ka umu-ndinyom Juda tegharia egwú ọṅù, N'ihi ikpé-Gi nile.

12 Jenu Zaion buruburu, b͕a kwa ya buruburu: Guanu ulo-elu-ya nile ọnu.

13 Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.

14 N'ihi na Nka bu Chineke, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi; Ya onwe-ya ganēdu ayi rue n'inwu-ọnwu.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan