Abụ Ọma 47 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma umu Kora. 1 Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka; Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke. 2 N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu; Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile. 3 Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi, Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi. 4 Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi, Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah 5 Chineke ewerewo iti-nkpu rigo, Jehova ewerewo olu opì-ike rigo. 6 Bùkuenu Chineke abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma: Bùkuenu Eze-ayi abù ọma, bùkuenu Ya abù ọma. 7 N'ihi na Eze nke uwa dum ka Chineke bu: Bùkuenu Ya abù ọma, maschil. 8 Chineke aghọwo eze mba nile: Chineke anọkwasiwo n'oche-eze nsọ Ya. 9 Ndi amara aha-ha nke ndi nile di iche iche achikọtawo onwe-ha Ibu ndi Chineke nke Abraham: N'ihi na Chineke nwe ọta nile nke uwa; Emewo ka Ọ di elu nke-uku. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria