Abụ Ọma 46 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora; n'elu Alamoth. Abù. 1 Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile. 2 N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri; 3 Mb͕e miri-ya nāb͕a aghara nāsu kwa ufufu, Mb͕e ugwu nile nēme nkpatu site na nbili-elu ya. Selah 4 Otù osimiri di, miri-iyi-ya nile nēme ka obodo Chineke ṅuria ọṅu, Bú ebe nsọ nke ebe-obibi nile nke Onye kachasi ihe nile elu. 5 Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ. 6 Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze. 7 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah 8 Jenu, hu ọlu nile nke Jehova, Onye doworo ihe-iju-anya di iche iche n'uwa, 9 Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku. 10 Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa. 11 Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria