Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 41 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-sisi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n'imeso onye nēnweghi ike: N'ubọchi ihe ọjọ Jehova gēme ka ọ wepuga onwe-ya.

2 Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa; Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.

3 Jehova gākwagide ya n'elu ihe o ji edina mb͕e aru nādighi ya ike: Ihe-ndina-ya nile ka I b͕anweworo n'ọria ya.

4 Mu onwem siri, Jehova, merem amara: Me ka nkpuru-obim diri ndu; n'ihi na emehiewom megide Gi.

5 Ndi-irom nēkwu ihe ọjọ bayerem, si. Òle mb͕e ọ gānwu, aha-ya ewe la n'iyì?

6 Ọ buru kwa na ọ bia ihum, ihe-efu ka ọ nēkwu; Obi-ya nāchikọtara onwe-ya ajọ ihe: Ọ nāpu n'èzí nēkwu ya.

7 Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem: N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ.

8 Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru: E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ.

9 Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem.

10 Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, Ka m'we kwughachi ha ugwọ.

11 Nka ka m'ji mara na ihem nātọ Gi utọ, N'ihi na onye-irom adighi-eti nkpu nmeri n'arum.

12 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka I jideworom, We me ka m'guzosie ike n'iru Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Amen, na Amen.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan