Abụ Ọma 38 - Bible NsoAbù Ọma Devid, ime ka echeta echeta. 1 Jehova, abalaram nba n'iwe-Gi: Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi. 2 N'ihi na àkú-Gi nile efedakwasiwom, Aka-Gi adakwasiwokwam. 3 Ọ dighi izu-okè ọ bula di n'anu-arum n'ihi iwe-Gi; Ọ dighi kwa udo ọ bula di n'ọkpukpum nile n'ihi nmehiem. 4 N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́. 5 Ufiri-utalim nile nēsì ísì, nāb͕u kwa miri, N'ihi uchem b͕agọro ab͕agọ. 6 Ab͕agọrọm ab͕agọ ruda kwa nke-uku; Ogologo ubọchi nile ka m'jeghariworo nēyi uwe-nkpe. 7 N'ihi na úkwùm juputara na nruru-ọku; Ọ dighi kwa izu-okè ọ bula di n'anu-arum. 8 Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku: Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim. 9 Onye-nwe-ayi, n'iru Gi ka ichọsi-ikem nile di; Ize-umem ezonarighi kwa Gi. 10 Obim nēti ike ike, ikem esiwo nimem la: Ìhè nke anyam abua kwa, ọbuná ìhè nke anyam ahu adighi n'arum. 11 Ndi nāhum n'anya na ndi-eyìm nēguzo iche na ncherita-iru ihe-otitim; Ndi-ab͕ata-obim nēguzo kwa n'ebe di anya. 12 Ndi nāchọsi nkpuru-obim ike nēsi-kwa-ram ọnyà; Ndi nāchọ imem ihe ọjọ ekwuwo kwa ihe-ila-n'iyì di iche iche, Ọ bu kwa ihe-aghughọ nile ka ha nātughari n'uche ogologo ubọchi nile. 13 Ma mu onwem, dika onye nti chiri, adighm-anu ihe; Adikwam ka onye-ob͕i nke nādighi-asaghe ọnu-ya. 14 E, adim ka madu nke nādighi-anu ihe Onye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya. 15 N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo: Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem. 16 N'ihi na asirim, Ka ha ghara iṅuri ọṅu n'arum: Mb͕e anēwezuga ukwum n'ọnọdu-ya, ha mere onwe-ha ka ha di uku imegidem. 17 N'ihi na mu owem gaje ije nsukwra-achi, Ihe-nb͕um di kwa na ncherita-irum mb͕e nile. 18 N'ihi na m'gēgosi ajọ omumem; M'gēcheb͕u onwem bayere nmehiem. 19 Ma ndi-irom nādi ndu, nwe ume: Ha ba-kwa-ra uba, bú ndi nākpọm asì n'uzọ okwu-ugha. 20 Ndi ahu kwa nke nākwughachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe Nēmegidem, n'ihi na anamab͕aso ezi ihe. 21 Arapulam, Jehova: Chinekem, anọlam n'ebe di anya. 22 Bia ọsọsọ iyerem ka, Onye-nwe-ayi, bú nzọputam. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria