Abụ Ọma 36 - Bible NsoAbù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke orù Jehova, bú Devid. 1 Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obim Ọ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua. 2 N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya, Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì. 3 Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma. 4 Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya; Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma; Ọ dighi-aju ihe ọjọ. 5 Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di; Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé. 6 Ezi omume-Gi di ka ugwu Chineke; Ikpé-Gi nile bu ob͕u-miri riri nne: Ọ bu madu na anumanu ka I nāzọputa, Jehova. 7 Le ka ebere-Gi si di oké ọnu-ahia, Chineke! Umu madu nāb͕abá kwa n'okpuru ǹdò nkù-Gi abua. 8 Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua. 9 N'ihi na n'ebe I nọ ka isi-iyi ndu di: N'ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè. 10 Me ka ebere-Gi digidere ndi mara Gi; Me kwa ka ezi omume-Gi digidere ndi ziri ezi n'obi. 11 Ekwela ka ukwu npako biakwasim, Ekwe-kwa-la ka aka nke ndi nēmebi iwu me ka m'wagharia. 12 N'ebe ahu ka ndi nālu ajọ ihe daworo: Enudawo ha, ha apughi kwa ibili ọzọ. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria