Abụ Ọma 33 - Bible Nso1 Tienu nkpu ọṅù nime Jehova, unu ndi ezi omume: N'ebe ndi ziri ezi nọ otuto mara nma. 2 Werenu ubọ-akwara kele Jehova: Werenu une nke akwara iri bùkue Ya abù ọma. 3 Bùkueune Ya abù ọhu; Werenu iti-nkpu me ka ọkpukpọ-ubọ di nma. 4 N'ihi na okwu Jehova ziri ezi; Anālu kwa ọlu-Ya nile n'ikwesi-ntukwasi-obi. 5 Ọ nāhu ezi omume na ezi ikpé n'anya: Uwa juputara n'ebere jehova. 6 Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile. 7 Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche. 8 Ka uwa nile tua egwu Jehova: Ka ndi nile ndi bi n'elu-uwa dum madu bi tua ujọ Ya. 9 N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo. 10 Jehova emebiwo ndum-ọdu mba nile: Ọ siwo èchìchè nile nke ndi di iche iche, É-è. 11 Ndum-ọdu Jehova nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi, Èchìchè nile nke obi-Ya rue ọb͕ọ nile. 12 Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa. 13 Jehova siri n'elu-igwe legide anya; Ọ huwo umu madu nile; 14 Ọ siwo n'ọnọdu ebe-obibi-Ya Lekwasi ndi nile bi n'uwa anya; 15 Bú Onye ahu Nke nākpu obi ha nile n'otù, Nke nāghọta kwa ọlu nile nke ha nile. 16 Ọ dighi eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: Adighi-eji kwa ike riri nne naputa dike. 17 Nání ihe-nrafu ka inyinya bu iji zọputa madu: Ọ dighi-eji kwa ike-ya riri nne me ka madu wepuga onwe-ya. 18 Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya; 19 Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu. 20 Nkpuru-obi-ayi echerewo Jehova: Iye-aka-ayi na ọta-ayi ka Ọ bu. 21 N'ihi na ọ bu nime Ya ka obi-ayi nāṅuri ọṅu, N'ihi na ọ bu aha nsọ Ya ka ayi tukwasiworo obi. 22 Jehova, ka ebere-Gi dikwasi ayi, Dika ayi chereworo Gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria