Abụ Ọma 30 - Bible NsoAbù Ọma; Abù nke ira Ulo ahu nye Chineke; Abù Ọma nke Devid. 1 M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam. 2 Jehova, bú Chinekem, Etikurum, I, I we me ka m'diri ndu. 3 Jehova, I mewo ka nkpuru-obim si n'ala-mọ rigoputa: I mewo ka m'si n'etiti ndi nārida n'olùlù di ndu. 4 Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya, Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ. 5 N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi. 6 Ma mu onwem, asirim n'udom, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi. 7 Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m: I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji. 8 Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara: 9 Ùrù gini di n'ọbaram, mb͕e m'na-arida n'olùlù? Ájá, ọ̀ gēkele Gi? ò gēgosi ezi-okwu-Gi? 10 Nuru, Jehova, me-kwa-ram amara: Jehova, buru onye nēyerem aka. 11 I b͕anweworom iti-aka-n'obim ka ọ ghọ ite-egwú; I tọpuwo ákwà-nkpem, were ọṅù kem dika ihe-ọkiké: 12 Ka nsọpurum we bùkue Gi abù ọma, ghara idere du. Jehova, bú Chinekem rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gēkele Gi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria