Abụ Ọma 3 - Bible NsoAbù Ọma Devid, mb͕e o siri n'iru Absalom nwa-ya b͕alaga. 1 Jehova, le otú ndi nākpab͕um bara uba! Ọtutu madu nēbili imegidem. 2 Ọtutu madu nēkwu okwu bayere nkpuru-obim, si, Ọ dighi nzọputa diri ya nime Chineke. 3 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu. 4 Ejim olum kpọkue Jehova, O we zam site n'ugwu nsọ Ya. 5 Mu onwem dinara ala, raru ura; Etetaram; n'ihi na Jehova nākwagidem. 6 M'gaghi-atu egwu ìgwè ndi nkem anāpughi iguta aguta, Ndi doworo onwe-ha imegidem buruburu. 7 Bilie, Jehova; zọputam, Chinekem: N'ihi na I tiwo ndi-irom nile ihe na ǹtì; I tipiawo ezé ndi nēmebi iwu. 8 Jehova nwe nzọputa: Ka ngọzi-Gi dikwasi ndi-Gi. Selah |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria