Abụ Ọma 29 - Bible NsoAbù Ọma Devid. 1 Nyenu Jehova, unu umu Chineke, Nyenu Jehova nsọpuru na ike. 2 Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya; Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ. 3 Olu Jehova di n'elu miri: Chineke nke ebube nāma éb͕è-elu-igwe, Jehova nọ n'elu ọtutu miri. 4 Olu Jehova nāda n'ike; Olu Jehova nāda n'ima-nma. 5 Olu Jehova nētiwa osisi cedar; Jehova we tiwasia osisi cedar nke Lebanon. 6 Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu. 7 Olu Jehova nāwaputa ire ọku. 8 Olu Jehova nēme ka ọzara me nkpatu; Jehova nēme ka ọzara Kedesh me nkpatu. 9 Olu Jehova nēme ka ime nēme nne-ele, Ọ nāb͕uchapu kwa akwukwọ osisi oké ọhia: Ọzọ n'ulo uku Ya ihe hile nāsi, Ebube. 10 Jehova nọduru n'oche-eze n'Iju-miri ahu; Jehova we nọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi. 11 Jehova gēnye ndi-Ya ike; Jehova gēji udo gọzie ndi-Ya. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria