Abụ Ọma 28 - Bible NsoAbú Ọma nke Devid. 1 Gi, Jehova, ka m'nākpọku; Oké nkumem, echila nti n'ebe m'nọ: Ka I we ghara ib͕am nkiti, M'we yie ndi nārida n'olùlù. 2 Nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi, Mb͕e m'chiliri akam abua n'ebe ime-ime-ulo nke ebe nsọ Gi di. 3 Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu, Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe; Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha. 4 Nye ha dika ọlu-ha si di, na dika ijọ-njọ nke nmeso nile ha si di: Nye ha dika aka-ha si eme; Nyeghachi ha ihe ha mere. 5 N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo. 6 Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, N'ihi na Ọ nuwo olu aririọ-amaram nile. 7 Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya. 8 Jehova buru ya ike, Ebe siri ike nke nzọputa nke onye nke Ya etere manu ka Ọ bu. 9 Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria