Abụ Ọma 26 - Bible NsoAbù Ọma nke Devid. 1 Kpem ikpe, Jehova, n'ihi na mu onwem ejewo ije n'izu-okèm: Ọ bu kwa na Jehova ka m'tukwasiworo obi, ukwum adighi-ab͕uchapu. 2 Nwà m, Jehova, nwaputakwam; Nucha akurum abua na obim. 3 N'ihi na ebere-Gi di n'iru anyam; Ejeghariwokwam n'ezi-okwu-Gi. 4 Mu na madu efu anọkọghi; Mu na ndi-iru-abua adighi-abàkọ kwa. 5 Akpọwom nkpọkọta ndi nēme ihe ọjọ asì, Mu na ndi nēmebi iwu adighi-anọkọ kwa. 6 Agamakwo ọbu-akam abua na-emeghi-ihe-ọjọ; We b͕a ebe-ichu-àjà-Gi buruburu otú a, Jehova: 7 Ime ka ege nti olu ekele, Na ikọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile. 8 Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi. 9 Achikọtala nkpuru-obim na ndi-nmehie n'otù, Achikọta-kwa-la ndum na ndi-ọbara n'otù: 10 Ndi nzube ọjọ di n'ka-ha, Aka-nri-ha juputa-kwa-ra n'iri-ngo. 11 Ma mu onwem, n'izu-okèm ka m'gēje ije: B͕aputam, me-kwa-ram amara. 12 Ukwum eguzowo n'ala di lari: Nime nkpọkọta madu nile ka m'gāgọzi Jehova. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria