Abụ Ọma 25 - Bible NsoAbù Ọma nke Devid. 1 Gi, Jehova, ka m'nēbuliri nkpuru-obim. 2 Chinekem, na Gi ka m'tukwasiworo obi, Ekwela ka ihere mem; Ekwela ka obi ndi-irom tọ ha utọ n'arum. 3 Ọzọ, ndi nile ndi nēle anya Gi, ihere agaghi-eme ha: Ihere gēme ndi nāghọ aghughọ n'efu. 4 Jehova, me ka m'mara uzọ-gi nile; Zím okporo-uzọ-Gi nile. 5 Mem ka m'zọ ije n'ezi-okwu-Gi, Gi zíkwam ihe; N'ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam; Gi ka m'nēle anya Gi ogologo ubọchi nile. 6 Cheta obi-ebere-Gi nile, Jehova, ha na ebere-Gi nile; N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi ka ha diworo. 7 Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova. 8 Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu: Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ. 9 Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé: Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya. 10 Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ. 11 N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne. 12 Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova? O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa. 13 Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma, Nkpuru-ya gēnweta kwa ala. 14 Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya; Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe. 15 Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile; N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta. 16 Chem iru, me-kwa-ram amara; N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu. 17 Ahuhu nile nke obim sara mbara: Me ka m'si na nkpàm nile puta. 18 Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm; Bupu kwa nmehiem nile. 19 Hu ndi-irom, n'ihi na ha di ọtutu; Ha ji ikpọ-asi nke na-eme ihe-ike kpọm asi. 20 Debe nkpuru-obim, naputakwam: Ekwela ka ihere mem, n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. 21 Ka izu-okè na izi-ezi chezim, N'ihi na elewom anya Gi. 22 Chineke, b͕aputa Israel Na nkpà-ya nile. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria