Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 24 - Bible Nso


Abù Ọma Devid.

1 Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.

2 N'ihi na Ya onwe-ya atọwo ntọ-ala-ya n'elu oké osimiri nile, Me kwa ka o guzosie ike n'elu osimiri nile.

3 Ònye gārigo n'ugwu Jehova? Ònye gēguzosi kwa ike n'ebe nsọ Ya?

4 Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha; Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu, Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.

5 Ọ gānata ngọzi n'aka Jehova, Na ezi omume naka Chineke nke nzọputa-ya.

6 Nka bu ọb͕ọ nke ndi nācho Ya, Bú ndi nāchọsi iru-Gi ike, Chineke nke Jekob. Selah

7 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Ka ebuli kwa unu elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa.

8 Ònye kwa bu Eze ebube a? Ọ bu Jehova, Nke bu dìnkpà na dike, Ọ bu Jehova, Nke bu dike n'agha.

9 Ọnu-uzọ-ama, bulienu isi-unu elu; Buli-kwa-nu ha elu, ọnu-uzọ ebighi-ebi: Eze ebube gābata kwa.

10 Ònye ka Ọ bu, bú Eze ebube a? Ọ bu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya onwe-ya bu Eze ebube a. Selah

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan