Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 22 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nelu Aijeleth hash-Shahar. Abù Ọma Devid.

1 Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?

2 Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere.

3 Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.

4 Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi: Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu.

5 Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha: Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha.

6 Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya.

7 Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi: Ha na-enu ọnu, fufè isi, si,

8 Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.

9 Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem.

10 Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa: Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem.

11 Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.

12 Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.

13 Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja.

14 Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm.

15 Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm.

16 N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua.

17 Anamagu ọkpukpum nile ọnu; Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya:

18 Ha nēkère onwe-ha uwem, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà.

19 Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.

20 Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita.

21 Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.

22 Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi.

23 Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya; Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya; Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel.

24 N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.

25 N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.

26 Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ: Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya: Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.

27 Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.

28 N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze: Ọ nāchi kwa mba nile.

29 Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala: N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala, Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu.

30 Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè; Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi.

31 Ha gābia gosi otù ndi agàmuputa n'iru ezi omume-Ya, Na O mewo ya.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan