Abụ Ọma 17 - Bible NsoEkpere Devid. 1 Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe. 2 Ka ikpém si n'iru Gi puta; Anya-Gi nāhu izi-ezi. 3 I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè. 4 Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya. 5 Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha. 6 Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke: Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum. 7 Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi Site n'iru ndi nēbili imegide ha. 8 Debem dika nwa-anya-Gi, Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi, 9 Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu. 10 Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako. 11 Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi: Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala. 12 Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo. 13 Bilie, Jehova, Buru ya uzọ, me ka o ruru ala: Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi; 14 N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru. 15 Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria