Abụ Ọma 16 - Bible NsoMichtam nke Devid. 1 Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi. 2 Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu: Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru. 3 Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa, Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ: 4 Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova: M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara, M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum. 5 Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom: Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà. 6 Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ; N'ezie ihe-nketam dim ezi nma. 7 M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu: Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile. 8 Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum. 9 N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi. 10 N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi. 11 I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria