Abụ Ọma 150 - Bible Nso1 Tonu Ja. Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya: Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya. 2 Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile: Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di. 3 Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. 4 Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya: 5 Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya. 6 Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria