Abụ Ọma 149 - Bible Nso1 Tonu Ja. Bùkuenu Jehova abù ọhu, Bú otuto-Ya nime nkpọkọta ndi-ebere-Ya. 2 Ka Israel ṅuria n'Onye meworo ya: Ka umu Zaion tegharia egwú ọṅù n'Eze-ha. 3 Ka ha to aha-Ya n'ite-egwú: Ka ha chiri egwú-otiti na ubọakwara bùkue Ya abù ọma. 4 N'ihi na ihe ndi-Ya nātọ Jehova utọ: Ọ gēji nzọputa chọ ndi di ume-ala n'obi nma. 5 Ka ndi-ebere ṅuri ọṅu-agha nime nsọpuru: Ka ha tie nkpu ọṅò n'elu ihe-ndina-ha. 6 Ka nbuli-elu Chineke di n'olu abu ha, Ka mma-agha nke iru abua di kwa n'aka-ha; 7 Ibọ̀ ọ́bọ̀ n'aru mba nile, Ibara ndi nile di iche iche nba; 8 Iji nkpọrọ ke ndi-eze-ha, Na iji nkpọro-ukwu ígwè ke ndi-ha anāsọpuru; 9 Ime n'aru ha ikpé edere n'akwukwọ: Ihe mara nma ka ọ bu nke ndi-ebere-Ya nile nwere. Tonu Ja. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria