Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 148 - Bible Nso

1 Tonu Ja. Tonu Jehova site n'elu-igwe: Tonu Ya n'ebe di elu.

2 Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile.

3 Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè.

4 Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe.

5 Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha.

6 O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.

7 Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile:

8 Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya:

9 Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile:

10 Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù:

11 Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa:

12 Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:

13 Ka ha too aha Jehova; N'ihi na emewo ka aha-Ya di elu, nání ya: Ebube-Ya di n'elu uwa na elu-igwe.

14 O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan