Abụ Ọma 145 - Bible NsoAbù Ọma otuto; nke Devid. 1 M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. 2 Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. 3 Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya. 4 Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile. 5 N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche. 6 Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya. 7 Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya. 8 Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu; Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere. 9 Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile. 10 Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi. 11 Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya; 12 Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya. 13 Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile. 14 Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala. 15 Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. 16 I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya. 17 Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile. 18 Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya, Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu. 19 Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme; Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha. 20 Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu. 21 Otuto Jehova ka ọnum gēkwu; Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria