Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 142 - Bible Nso


Maschil Devid, mb͕e ọ nọ n'ọb͕a; ekpere.

1 Olum ka m'ji etiku Jehova; Olum ka m'ji ariọ Jehova aririọ-amara.

2 Anamekwuwa okwu ntamum n'iru Ya; Ahuhum ka m'nēgosi n'iru Ya.

3 Mb͕e mọm nēnweghi ike nimem, Gi onwe-gi mara okporo-uzọm. N'uzọ nke m'nēje ije nime ya ka ha zobeworom ib͕udu.

4 Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.

5 Etikurum I, Jehova; Asirim, Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm, Na òkèm n'ala ndi di ndu.

6 Ṅa nti n'iti-nkpum; n'ihi na enweghm ike ma-ọli: Naputam n'aka ndi nēsob͕um; n'ihi na ha nwere ume karim.

7 Me ka nkpuru-obim si n'ebe emechibidoworo ya puta, ka m'we kele aha-Gi: Mu ka ndi ezi omume gāb͕a buruburu; N'ihi na I nēmesom nke-ọma.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan