Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 14 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid.

1 Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe.

2 Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke.

3 Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.

4 Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m, Ma ha akpọkughi Jehova.

5 N'ebe ahu ka ha turu oké egwu; N'hi na Chineke nọ n'ọb͕ọ onye ezi omume.

6 Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere, N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.

7 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan