Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 139 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram.

2 Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.

3 Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.

4 N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.

5 N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum.

6 Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya.

7 Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga?

8 Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.

9 Ọ buru na achirim nkù nke ututu, Biri n'akuku dikarisiri anya nke oké osimiri,

10 Ọbuná n'ebe ahu ka aka-Gi gēdurum, Aka-nri-gi gējidekwam.

11 M'we si, N'ezie, ọchichiri gēkpuchim; Ma abali ghọrọ ìhè buruburum.

12 Ọbuná ọchichiri adighi-ab͕achiri Gi; Ma abali nēnye ìhè dika ehihie: Dika ọchichiri si di, otú a ka ìhè di n'anya-Gi

13 N'ihi na Gi onwe-gi enwetawo akurum abua: I nākpam n'afọ nnem dika esi ákpa ákwà.

14 M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.

15 Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.

16 Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.

17 Le ka èchìchè-Gi nile si di oké ọnu-ahia n'anyam, Chineke! Le ka ọnu-ọgugu nile ha si di uku ri nne!

18 Ọ buru na aguam ha ọnu, ha bara uba kari ájá: Mb͕e m'tetaworo, mu na I nānọgide.

19 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I b͕ue onye nēmebi iwu, Chineke: Ya mere, unu ndi-ọbara, sinu n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu.

20 Ha bu ndi nēkwu okwu megide Gi nime nzube ọjọ, Ndi ebuliworo nye ihe-efu ka ndi-iro-Gi bu.

21 Ọ̀ bughi ndi nākpọ Gi asì, jehova, ka m'nākpọ asì? Ọ̀ bughi kwa ndi nēbili imegide Gi ka m'nāsọ oyi?

22 Ọ bu ikpọ-asì nke zuru okè ka m'ji kpọ ha asì: Ndi-iro ka ha burum.

23 Gwuputa ala obim, Chineke, we mara obim: Nānwam, we mara iche-uchem nile:

24 Hu kwa ma ọ di uzọ ọ bula nēweta ihe-nb͕u di nimem, Durukwam n'uzọ ebighi-ebi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan