Abụ Ọma 136 - Bible Nso1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 2 Kelenu Chineke kachasi chi nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 3 Kelenu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 4 Kelenu Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 5 Kelenu Onye ji nghọta eme elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 6 Kelenu Onye meworo ala ka ọ sa mbara n'elu miri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 7 Kelenu Onye meworo ìhè uku di iche iche: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 8 Bú anyuanwu ichi n'ehihie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 9 Na ọnwa na kpakpando ichi n'abali: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 10 Kelenu Onye nētib͕u Ijipt nime umu-ha eburu uzọ mu: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 11 O we me ka Israel si n'etiti ha puta: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 12 Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 13 Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 14 O we me ka Israel gabiga n'etiti ya: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 15 Ma O rurupuru Fero na usu-ndi-agha-ya n'Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 16 Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di. 17 Kelenu Onye tib͕uworo ndi-eze di uku: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 18 O b͕u-kwa-ra ndi-eze di ebube: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 19 Bú Saihon eze ndi-Amorait: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 20 Na Og eze Beshan: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 21 O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 22 Iburu Israel, bú orù-Ya, ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 23 Onye chetara ayi n'ọnọdu-ayi di ala: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: 24 O we naputa ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi. N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 25 Ọ nēnye anu-aru nile nri: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 26 Kelenu Chineke nke elu-igwe: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria