Abụ Ọma 135 - Bible Nso1 Tonu Ja. Tonu aha Jehova; Tonu Ya, ndi-orù Jehova: 2 Ndi nēguzo n'ulo Jehova, N'ogige nile nke ulo Chineke-ayi. 3 Tonu Ja; n'ihi na Jehova di nma: Bùkuenu aha-Ya abù ọma; n'ihi na ọ di utọ. 4 N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya, Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya. 5 N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku, Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile. 6 Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile. 7 Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta. 8 Onye tib͕uru umu eburu uzọ mu n'ala Ijipt, Ma ọ bu madu ma-ọbu anu-ulo. 9 O zitere ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-ebube di iche iche n'etiti gi, Ijipt, N'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile. 10 Onye tib͕uru ọtutu mba, B͕u kwa ndi-eze di ike; 11 Bú Saihon eze ndi-Amorait, Na Og eze Beshan, Na ala-eze nile nke Kenean: 12 Ọ we nye ala-ha ibu ihe-nketa, Iburu Israel, bú ndi-Ya, ihe-nketa. 13 Jehova, aha-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Jehova, ncheta-Gi nādiru ọb͕ọ nile. 14 N'ihi na Jehova gēkpe ndi-Ya ikpe, Chèghari kwa uche-Ya bayere ndi-orù-Ya. 15 Arusi nile nke mba nile bu ọla-ọcha na ọla-edo, Ọlu aka madu. 16 Ha nwere ọnu ma ha adighi-ekwu okwu; Ha nwere anya abua, ma ha adighi-ahu uzọ; 17 Ha nwere nti abua, ma ha adighi-aṅa nti; Ọ dighi kwa iku-ume di n'ọnu-ha. 18 Ndi nēme ha gādi ka ha; E, onye ọ bula nke nātukwasi ha obi. 19 Ulo Israel, gọzienu Jehova: Ulo Eron, gọzienu Jehova: 20 Ulo Livai, gọzienu Jehova: Unu ndi nātu egwu Jehova, gọzienu Jehova. 21 Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion, Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria