Abụ Ọma 133 - Bible NsoAbú Nrigo; nke Devid. 1 Le, ka o si di nma, ka o si di kwa utọ nke-uku, Bú nbikọ nke umu-nne, ọbuná ibikọ n'otù! 2 Ọ di ka ezi manu ahu nke dikwasi n'isi, Nke nērùda n'afu-ọnu, Bú afu-ọnu Eron; Nke nēruda n'ọnu uwe-nwuda-ya nile; 3 Dika igirigi Heamon, Nke nādakwasi n'ugwu nile nke Zaion: N'ihi na n'ebe ahu ka Jehova nyere ngọzi ahu iwu, Bú ndu rue mb͕e ebighi-ebi. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria