Abụ Ọma 132 - Bible NsoAbú Nrigo. 1 Jehova, chetara Devid Nweda-n'ala-ya nile. 2 Otú ọ ṅuru Jehova iyi, Kwe Dike nke Jekob nkwa: 3 N'ezie m'gaghi-abà n'ulo-ikwū nke ulom, M'gaghi-arigo n'elu ihe-ndina nke utem; 4 M'gaghi-enye anyam abua ura, M'gaghi-enye mbubere-anyam irù-ura; 5 Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu, Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi. 6 Le, ayi nuru okwu bayere ya n'Efrata: Ayi chọtara ya n'ọhia nke oké ọhia. 7 Ka ayi ba n'ebe-obibi-Ya nile; Ka ayi kpọ isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di. 8 Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi. 9 Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe; Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu. 10 N'ihi Devid, bú orù-Gi, Atugharila iru onye-Gi etere manu. 11 Jehova aṅuworo Devid iyi bu ezi-okwu; Ọ gaghi-esi na ya laghachi azu: Ndi sitere na nkpuru nke afọ-gi ka M'gādọkwasi n'oche-eze i nwere. 12 Ọ buru na umu-gi edebe ọb͕ub͕a-ndum Na ihe-àmàm nke M'gēzí ha, Umu-ha gānọkwasi kwa n'oche-eze i nwere rue mb͕e nile ebighi-ebi. 13 N'ihi na Jehova arọputawo Zaion; Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi. 14 Nka bu ebe-izu-ikem rue mb͕e nile ebighi-ebi: N'ebe a ka M'gēbi; n'ihi na achọsiwom ya ike. 15 Ihe-oriri-ya ka M'gāgọzi nke-uku: Ndi-ob͕eye-ya bu ndi M'gēji nri me ka afọ ju ha. 16 Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe: Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike. 17 N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro. 18 Ndi-iro-ya ka M'gēyikwasi ihere dika uwe: Ma n'isi-ya ka okpu-eze-ya gāb͕awa okoko. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria