Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 13 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?

2 Rùe ole mb͕e ka m'gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim, Nēru újú n'obim n'ehihie nile? Rùe ole mb͕e ka agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?

3 Legide anya, zam, Jehova, Chinekem: Nye anyam abua ìhè, ka m'we ghara iraru ura ọnwu;

4 Ka onye-irom we ghara isi, Akariwom ya n'ike; Ka ndi-nkpab͕um we ghara iteghari egwú ọṅù mb͕e anēwezugam n'ọnọdum.

5 Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi; Ka obim tegharia egwú ọṅù na nzọputa-Gi:

6 Ka m'bùkue Jehova abù, N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan