Abụ Ọma 128 - Bible NsoAbú Nrigo. 1 Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu, Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile. 2 N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma. 3 Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi: Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi. 4 Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahu Nke nātu egwu Jehova. 5 Jehova gēsi na Zaion gọzie gi: Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi, 6 Hu kwa umu nke umu-gi gāmu. Ka udo dikwasi Israel. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria