Abụ Ọma 127 - Bible NsoAbù Nrigo; nke Solomon. 1 Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya. 2 Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura. 3 Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu: Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu. 4 Dika àkú n'aka dike, Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di. 5 Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya: Ihere agaghi-eme ha, Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n'ọnu-uzọ-ama. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria