Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 126 - Bible Nso


Abú Nrigo.

1 Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.

2 Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu, Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire: Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile, Jehova emeworo ndia ihe uku.

3 Jehova emeworo ayi ihe uku; Ayi nāṅuri ọṅu.

4 Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata, Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.

5 Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.

6 Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá; Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan