Abụ Ọma 125 - Bible NsoAbú Nrigo. 1 Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide. 2 Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu: Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu. Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. 3 N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà; Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume. 4 Jehova, me ndi di nma nma, Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma. 5 Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria