Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 122 - Bible Nso


Abú Nrigo; nke Devid.

1 Aṅuririm ọṅu mb͕e ha nāsim, Ka ayi je n'ulo Jehova.

2 Ukwu-ayi eguzowo N'ọnu-uzọ-ama-gi nile, Jerusalem;

3 Jerusalem, nke ewuworo Dika obodo nke ejikọtara n'otù nke-ọma:

4 Ebe ebo nile rigoworo, bú ebo nile nke Ja, Iburu Israel ihe-àmà, Ikele aha Jehova.

5 N'ihi na n'ebe ahu ka edoworo oche-eze nile ikpe ikpe, Bú oche-eze nile ulo Devid nwere.

6 Riọnu aririọ bayere udo Jerusalem: Ndi nāhu gi n'anya gānọ n'udo.

7 Ka udo di n'ékpè-gi nile, Ka inọ-n'udo di kwa n'ulo-gi nile di elu.

8 N'ihi umu-nnem na ndi-eyìm, Biko, ka m'kwue okwu, si, Ka udo di nime gi.

9 N'ihi ulo Jehova, bú Chineke-ayi, M'gāchọrọ gi ọdi-nma.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan