Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 121 - Bible Nso


Abú Nrigo.

1 M'gēweli anyam abua le ugwu nile: Òle ebe iye-akam gēsi bia?

2 Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia, Onye meworo elu-igwe na uwa.

3 Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.

4 Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel.

5 Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi.

6 Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali.

7 Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.

8 Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi, Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan