Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 12 - Bible Nso


Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Octave. Abù Ọma Devid.

1 Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo; N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu.

2 Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.

3 Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ, Na ire nke nēkwu oké ihe:

4 Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike; Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?

5 N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

6 Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha; Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala, Nke esichaworo ub͕ò asa.

7 Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha, I gēchezi ha ka ha pua n'aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi.

8 Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu, Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan