Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 118 - Bible Nso

1 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

2 Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

3 Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

4 Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

5 M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara.

6 Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?

7 Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì.

8 Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.

9 Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.

10 Mba nile ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

11 Ha ab͕awom buruburu; e, ha ab͕awom buruburu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

12 Ha ab͕awom buruburu dika aṅu; emenyuwo ha dika ọku ogwu: N'aha Jehova ka m'gēbipusi ha.

13 I nudawom enuda ka m'we da: Ma Jehova yerem aka.

14 Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa.

15 Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

16 Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà.

17 M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.

18 Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom.

19 Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja.

20 Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya.

21 M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa.

22 Nkume nke ndi nēwu ulo juru Aghọwo isi nkuku ulo.

23 Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi.

24 Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.

25 Biko, Jehova, zọputa, biko: Biko, Jehova, me ka ihe nāgara ayi nke-ọma, biko.

26 Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Jehova: Ayi esiwo n'ulo Jehova gọzie unu.

27 Chineke ka Jehova bu, Ọ nyewo kwa ayi ìhè: Chiri udọ̀ ke àjà-ememe, durue ya na mpi nile nke ebe-ichu-àjà.

28 Chinekem ka I bu, m'gēkele kwa Gi: Chinekem ka I bu, m'gēbuli Gi elu.

29 Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan