Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 116 - Bible Nso

1 Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānu Olum, bú aririọ-amaram nile.

2 N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ, Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya.

3 Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram: Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.

4 M'we kpọkue aha Jehova; Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.

5 Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu; E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.

6 Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu: Enweghm ike, O we nyem nzọputa.

7 Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi; N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.

8 N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu, I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri, I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.

9 M'gējeghari n'iru Jehova N'ala nile nke ndi di ndu.

10 Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu: Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:

11 Mu onwem siri na nkujam Madu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.

12 M'gēsi aṅa nyeghachi Jehova Nmeso ọma Ya nile O mesoworom?

13 Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.

14 Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.

15 Ihe di oké ọnu-ahia n'anya Jehova Ka ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.

16 Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi: Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi; I tọpuwo ab͕um nile.

17 Gi ka m'gāchuru aja ekele, Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.

18 Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;

19 N'ogige nile nke ulo Jehova, N'etiti gi, Jerusalem. Tonu Ja.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan