Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 113 - Bible Nso

1 Tonu Ja. Tonu, unu ndi-orù Jehova, Tonu aha Jehova.

2 Ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

3 Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya Aha Jehova gābu ihe anēto eto.

4 Jehova di elu n'elu mba nile, N'elu elu-igwe ka ebube-Ya di.

5 Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi? Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di elu inọdu ka eze,

6 Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasi Elu-igwe na ilekwasi uwa anya.

7 Ọ bu onye nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie, O nēsi n'ebe ikpofu ahihia bulie ob͕eye elu;

8 Ime ka ya na ndi amara aha nọkọ, Ka ya na ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ya nọkọ.

9 Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n'ezi-na-ulo nke aka ya, Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom. Tonu Jehova.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan