Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -

Abụ Ọma 111 - Bible Nso

1 Tonu Ja. M'gēwere obim nile kele Jehova, N'ìzu nzuzo nke ndi ziri ezi, na nime nzukọ Israel.

2 Ọlu nile nke Jehova di uku, Buru ihe ndi nile ha nātọ utọ nāchọputa.

3 Ebube na ima-nma ka ọlu-Ya bu: Ezi omume-Ya nēguzo kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

4 Ihe-ncheta ka O meworo nye oké ọlu-Ya nile: Onye nēme ebere na Onye nwere obi-ebere ka Jehova bu.

5 Anu-ndọb͕u ka O nyeworo ndi nātu egwu Ya: Ọ gēcheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi.

6 O gosiwo ndi-Ya ike nke ọlu-Ya nile, N'inye ha ihe-nketa mba nile.

7 Ọlu nile nke aka-Ya bu ezi-okwu na ikpé ziri ezi; Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ukpuru-Ya nile bu.

8 Ihe anākwagide rue mb͕e nile ebighi-ebi ka ha bu, Ha bu ihe anēme n'ezi-okwu na izi-ezi.

9 Nb͕aputa ka O ziteworo ndi-Ya; O nyewo ọb͕ub͕a-ndu-Ya iwu rue mb͕e ebighi-ebi: Ihe di nsọ na ihe anātu egwu ka aha-Ya bu.

10 Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu; Ezi uche ka ndi nile nēme ha nwere: Otuto-Ya nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi.

Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.

Bible Society of Nigeria
Lean sinn:



Sanasan