Abụ Ọma 11 - Bible NsoAbù Oma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid. 1 Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu? 2 N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya, Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta, Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri. 3 N'ihi na anākwada ide nile; Gini ka onye ezi omume meworo? 4 Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu. 5 Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì. 6 Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha. 7 N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya: Ndi ziri ezi gāhu iru-ya. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria