Abụ Ọma 109 - Bible NsoAbú Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma Devid. 1 Chineke nke otutom, ab͕ala nkiti; 2 N'ihi na ọnu onye nēmebi iwu na ọnu aghughọ ka ha sagheworo megidem: Ha ewerewo ire okwu-ugha gwam okwu. 3 Ha ewerewo kwa okwu ikpọ-asì b͕am buruburu, We busom agha n'efu. 4 N'ọnọdu ihu-n'anya m'huru ha ha nēmegidem: Ma mu onwem nọ nēkpe ekpere. 5 Ha we tukwasim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe, Na ikpọ-asì n'ọnọdu ihu-n'anyam. 6 Me ka onye nēmebi iwu lekọta ya: Ka onye-nmegide guzo kwa n'aka-nri-ya. 7 Mb͕e anēkpe ya ikpe, ya puta ìhè na ọ bu onye ikpe mara; Ka ekpere-ya ghọ kwa nmehie. 8 Ka ubọchi-ya di ole-na-ole; Ka onye ọzọ nara ya ihe-nlekọta-ya. 9 Ka umu-ya buru umu-nb͕ei, Ka nwunye-ya buru nwayi di-ya nwuru. 10 Ka umu-ya nāṅaghari kwa mb͕e nile nāriọ kwa aririọ; Ka ha si kwa na nkponkpọ-ebe-ha nile nāchọ ihe-oriri-ha n'ebe di anya. 11 Ka onye-nbinye siri ihe nile o nwere ọnyà; Ka ndi ala ọzọ luta ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inweta n'agha. 12 Ekwela ka o nwe onye nọ nēmere ya ebere; Ekwe-kwa-la ka onye ọ bula di nke nēmere umu-nb͕ei-ya amara. 13 Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha. 14 Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà; Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya. 15 Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa. 16 N'ihi na o chetaghi ime ebere, O we sob͕ue nwoke ewedara n'ala na ob͕eye, Na onye obi-ya mebiri emebi, ime ka ha nwua. 17 Ọ hu-kwa-ra nkọcha n'anya, o we biakute ya; Ngọzi atọghi kwa ya utọ, o we di anya n'ebe ọ nọ. 18 O yiri-kwa-ra nkọcha dika uwe-nwuda-ya, O we ba nime ya dika miri, Ba kwa n'ọkpukpu-ya nile dika manu. 19 Ya diri ya ka uwe oji kpuchi onwe-ya, Ya buru kwa akpukpọ-úkwù o ji ke úkwù mb͕e nile. 20 Nka bu ugwọ-ọlu nke ndi nēmegidem, nke nēsi n'aka Jehova bia, Ọ bu kwa ugwọ-ọlu nke ndi nēkwu ihe ọjọ megide nkpuru-obim. 21 Ma Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye-nwe-ayi, kwe ka mu na I mekọ n'ihi aha-Gi: N'ihi na ebere-Gi di nma, naputam. 22 N'ihi na onye ewedara n'ala na ob͕eye ka m'bu, Adupuwo kwa nkpuru-obim nimem. 23 Dika onyinyo mb͕e ọ nēsetipu onwe-ya site n'ọdida anyanwu, otú a ka m'laworo: Arurupuwom dika igurube. 24 Ikperè-ukwum abua asuwo ngọngọ site n'obubu-ọnu; Anu-arum nāta aru nēnweghi abuba. 25 Mu onwem, aghọwo-kwa-ram ha ihe-ita-uta: Mb͕e ha nāhum ha nēfufe isi-ha. 26 Yerem aka, Jehova, Chinekem; Zọputam dika ebere-Gi si di: 27 Ka ha mara kwa na aka-Gi ka nka bu; Gi onwe-gi, Jehova, emewo ya. 28 Ndi ahu gākọcha, ma Gi onwe-gi nāgọzi: Ha ebiliwo, ihere we me ha, ma orù-Gi gāṅuri. 29 Ndi nēmegidem gēyiri ọnọdu-ihere dika uwe, Ha gēwere kwa ihere-ha kpuchie onwe-ha dika uwe-nwuda. 30 M'gēwere ọnum kele Jehova nke-uku; E, n'etiti ọtutu madu ka m'gēto Ya. 31 N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye, Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria